Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:19 - Bible Nso

19 Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n'idi-na-nsọ nke ọrurú-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:19
8 Iomraidhean Croise  

Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n'ulo-ya.


asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;


Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi.


Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú.


Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi.


Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.


Ekuru-kwa-la nwayi tiyere nwa-nne-ya nwayi, ikpab͕u ya, ikpughe ọtọ-ya, tiyere ya na ndu-ya.


Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan