Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 17:8 - Bible Nso

8 I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 17:8
16 Iomraidhean Croise  

Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.


Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.


ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n'iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti ndi-ya:


Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.


ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute imere ya Jehova, agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti umu-nna-ya.


Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova:


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Umu Israel we nu, si, Le, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase ewuwo ebe-ichu-àjà na ncherita-iru ala Kenean, nime buruburu-ala Jọdan, n'ofè umu Israel nwe.


Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si,


Otú a ka nzukọ nile nke Jehova siri, Gini bu ihe-nmekpu a nke unu mekpuworo megide Chineke Israel, isi n'iso Jehova chigharia ta, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà, inupu isi n'okpuru Jehova ta?


wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku.


I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m'gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme.


Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo.


Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan