Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 17:6 - Bible Nso

6 Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 17:6
12 Iomraidhean Croise  

I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.


I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.


Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:


ka umu Israel we weta àjà nile ha, nke ha onwe-ha nāchu n'ọhia sara iru, ọbuná ka ha we wetara ha Jehova, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, were ha biakute onye-nchu-àjà, chua ha ka ha buru ihe àjà nke àjà udo anāchuru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.


O gēbikwasi aka-ya n'isi-ya, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.


O gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku, nke di n'elu nkú nke di n'elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova.


ọ gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.


Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan