Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 16:4 - Bible Nso

4 Uwe-ime di nsọ nke ákwà ọcha ka o gēyiri, uwe-ukwu nke ákwà ọcha gādikwasi kwa n'anu-aru-ya, agēwere kwa ihe ike n'úkwù nke ákwà ọcha ke ya, akwa nkechi nke ákwà ọcha ka agēkpukwasi kwa ya: uwe nsọ ka ha bu; ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya, we yiri ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha, ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 16:4
23 Iomraidhean Croise  

I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.


Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.


mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ:


I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru.


N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike.


Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.


Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla.


Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu:


ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.


Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n'ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu:


Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà.


ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha:


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.


kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu;


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan