Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 16:34 - Bible Nso

34 Nka gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi, ikpuchiri umu Israel nmehie nile ha otù ub͕ò n'arọ. Ọ we me dika Jehova nyere Moses iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 “Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.” E mezuru ihe ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 16:34
14 Iomraidhean Croise  

N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.


Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.


Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.


Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu.


Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.


Moses we gwa umu Israel okwu, ha we me onye ahu nākocha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we tub͕ue ya na nkume. Umu Israel we me dika Jehova nyere Moses iwu.


Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.


Ọzọ, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje.


N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile.


Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.


ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n'iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n'ebe nsọ kwa-arọ;


ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan