Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 16:22 - Bible Nso

22 nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 16:22
13 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.


Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.


Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.


Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha.


ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru.


Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere:


Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu:


Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:


n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan