Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 16:16 - Bible Nso

16 ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 16:16
12 Iomraidhean Croise  

Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.


Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.


Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.


Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.


O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.


Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.


Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.


Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan