Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 16:13 - Bible Nso

13 ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n'elu ọku n'iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 16:13
16 Iomraidhean Croise  

I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.


ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.


I gēme kwa ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ: osisi acacia ka i gēji me ya.


Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.


Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.


Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.


tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.


Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.


ma ha agaghi-abata ihu ebe nsọ ahu ọbuná na obere oge, ka ha ghara inwu.


Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.


O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha.


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan