Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 15:5 - Bible Nso

5 Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 15:5
31 Iomraidhean Croise  

Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:


Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.


I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ:


Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu.


N'ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi:


onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.


Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.


onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.


onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.


onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova:


Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.


Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.


Onye nānọkwasi n'ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.


Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.


Madu ọ bula nke nēri ihe nwuru onye-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, n'etiti ndi amuru n'ala ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa, ọ gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ọ we di ọcha.


Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi.


Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?


n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.


Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan