Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 15:28 - Bible Nso

28 Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 “ ‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 15:28
9 Iomraidhean Croise  

Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.


Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.


Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:


Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.


Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:


ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan