Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 15:12 - Bible Nso

12 Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “ ‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 15:12
10 Iomraidhean Croise  

I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.


N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù; N'oghere ọnu-uzọ-ama nile, N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:


Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile.


Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù;


Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


N'ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova.


Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.


N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.


Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan