Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:8 - Bible Nso

8 Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:8
19 Iomraidhean Croise  

Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha.


onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.


O gēru kwa n'ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha.


Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha.


Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.


Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.


Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha.


i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya,


bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan