Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:7 - Bible Nso

7 ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:7
29 Iomraidhean Croise  

Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.


O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.


Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.


I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


Ọgu ízù atọ na iri, bú ízù ubọchi asa, ka ekpeworo n'ikpe bayere ndi-gi, baye-kwa-ra obodo nsọ gi, ime ka njehie bìe, na ime ka nmehie gwusia, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighi-ebi bata, na ikachita ọhù na omuma akàrà, na ite Onye nsọ ahu Nke kachasi ndi nsọ nile manu.


onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.


onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.


ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa:


ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n'iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n'Iru-anyanwu; ọ bu kwa n'iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa.


Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel.


nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.


onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru akwa-nb͕ochi ahu.


onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu.


Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.


Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.


onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa.


otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha:


N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,


O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu.


n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.


ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.


Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan