Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:6 - Bible Nso

6 nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n'ọbara nnunu ahu eb͕uru n'elu miri nērù erù:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:6
13 Iomraidhean Croise  

I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha:


onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n'elu miri nērù erù:


ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n'ihe ájá n'elu miri nērù erù:


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu.


Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.


N'ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n'ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n'otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n'otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya;


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan