Nka bu iwu nke anumanu, na nke anu-ufe, na nke anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu nime miri, na nke anu ọ bula nēnuputa enuputa n'elu uwa:
onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n'akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n'ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n'ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú.
Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya.
Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo;
Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.