Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:41 - Bible Nso

41 ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:41
10 Iomraidhean Croise  

ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha;


Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M'gākọchapu kwa ájá-ya n'aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya.


onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú:


ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.


Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n'azu obodo, n'ebe ruru árú.


ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.


ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan