Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:36 - Bible Nso

36 onye-nchu-aja gēnye kwa iwu ka akwapu ihe di n'ulo ahu, tutu onye-nchu-àjà abà nime ihu ihe-otiti ahu, ka aghara ime ka ihe nile nke di n'ulo ru árú: emesia onye-nchu-àjà gābà kwa ihu ulo ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:36
7 Iomraidhean Croise  

onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m'hu ihe dika ihe-otiti n'ulo:


ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n'ile anya;


Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu.


Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.


nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;


M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan