Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:32 - Bible Nso

32 Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:32
12 Iomraidhean Croise  

Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:


Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n'uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.


Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.


Nka gābu iwu onye-ekpenta n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà:


Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;


ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n'iru Jehova.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,


ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan