Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 14:19 - Bible Nso

19 Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 14:19
8 Iomraidhean Croise  

onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:


onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka nri ya:


onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.


Mb͕e madu gēmehie, site n'inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya:


ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan