Levitikọs 14:13 - Bible Nso13 o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. Faic an caibideil |
O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.