Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 13:6 - Bible Nso

6 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe abalị asaa nke a gafekwara, onye nchụaja ga-elekwa ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dịtụla ya mma, na ọnya ahụ agbasaghị nʼanụ ahụ ya, onye nchụaja ga-asị na ọ dị ọcha, nʼihi na ọ bụ naanị ọnya efu. Onye ahụ ga-asakwa uwe ya mmiri, mgbe ahụ dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 13:6
23 Iomraidhean Croise  

ekpere ọ bula, aririọ ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti nke obi-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di:


Gi nuru kwa n'elu-igwe ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.


Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.


Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha, Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?


N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.


Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n'ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta.


onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.


Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.


Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:


onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:


Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:


Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.


Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.


Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.


Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.


N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan