Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 13:59 - Bible Nso

59 Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n'uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

59 Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 13:59
12 Iomraidhean Croise  

Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;


ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:


Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Nka gābu iwu onye-ekpenta n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà:


Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha.


izi ihe n'ubochi nke iru-árú-ya na n'ubọchi nke idi-ọcha-ya: nka bu iwu ekpenta.


Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.


Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n'aru-ya pua, imeru ya nime ya;


Ndia bu ukpuru, nke Jehova nyere Moses n'iwu. n'etiti nwoke na nwunye-ya, n'etiti nna na nwa-ya nwayi, mb͕e ọ di na nwata n'ulo nna-ya.


Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.


Nka bu iwu ekworo, mb͕e nwayi nējehie, mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya, ọ we rua árú;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan