Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 13:52 - Bible Nso

52 O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 A ga-akpọ uwe ahụ, maọbụ akwa ajị anụ ahụ, maọbụ akwa ajị anụ a kpara akpa, maọbụ akwa ogho ọcha ahụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla ọkụ, nʼihi na ọrịa na-efe efe dị nʼime ya, nʼihi na ọrịa na-eweta mbibi ka ọ bụ. A ghakwaghị iji ọkụ rechapụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 13:52
10 Iomraidhean Croise  

Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.


Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa.


Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.


Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;


ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:


ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n'uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu.


Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan