Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 13:46 - Bible Nso

46 Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 13:46
22 Iomraidhean Croise  

ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.


Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n'oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n'ebe a rue mb͕e ayi nwuru?


Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha, Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka: Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.


Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;


onye-nchu-àjà gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na emewo ka ihe-otiti ekpenta si n'aru onye-ekpenta ahu la;


N'ihi na madu ọ bula nke anewedaghi n'ala n'otù ubọchi ahu, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.


Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya:


irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.


Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru.


Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n'aka-ha idebe nke ha natara n'aka-ayi.


bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù.


ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan