Levitikọs 12:8 - Bible Nso8 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, ọ gēwere-kwa nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibe-ya ka ọ buru kwa àjà-nmehie: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agēme kwa ya ka ọ di ọcha. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ” Faic an caibideil |
Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.