Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 12:8 - Bible Nso

8 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, ọ gēwere-kwa nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibe-ya ka ọ buru kwa àjà-nmehie: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agēme kwa ya ka ọ di ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 12:8
14 Iomraidhean Croise  

Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso Jehova bu àjà-nsure-ọku sitere n'anu-ufe, o gēsi n'etiti nduru ma-ọbu n'etiti umu-kpalakwukwu weta nso onyinye-ya iji biaru nso.


ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; agēme kwa ya ka ọ di ọcha site n'isi ọbara-ya. Nka bu iwu nke nwayi nke nāmu nwa, ma ọ bu nwoke ma-ọbu nwayi.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,


Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;


na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku.


Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà:


onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.


N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.


Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.


Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.


Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.


Jisus we ba n'ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;


N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan