Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 11:45 - Bible Nso

45 N'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, iburu unu Chineke: unu gādi kwa nsọ, n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

45 Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 11:45
22 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel.


Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.


Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.


M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.


Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu.


Nka bu iwu nke anumanu, na nke anu-ufe, na nke anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu nime miri, na nke anu ọ bula nēnuputa enuputa n'elu uwa:


Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di.


Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta.


Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ we di nsọ; n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova.


Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke.


M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.


ka unu we cheta me kwa ihe nile M'nyere n'iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ.


N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ.


Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu.


n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.


Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova; N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi: Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.


Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan