Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 11:35 - Bible Nso

35 Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 11:35
8 Iomraidhean Croise  

Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.


Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa.


Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú.


Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.


O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.


Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri.


Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan