N'ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu;
M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.