Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 10:9 - Bible Nso

9 Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 10:9
17 Iomraidhean Croise  

N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.


Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.


Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.


Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n'ogige di nime.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


Jehova we gwa Eron okwu, si,


Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.


onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n'iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine.


na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ.


N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.


Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;


onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya;


Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku;


Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n'ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e.


N'ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n'iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan