Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 10:2 - Bible Nso

2 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 10:2
25 Iomraidhean Croise  

Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.


O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.


Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.


Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.


Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.


Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke.


N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.


Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.


Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.


Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Ha we biaru nso, buru ha n'uwe-ime-ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru.


Jehova we gwa Moses okwu, mb͕e umu-ndikom abua nke Eron nwusiri, mb͕e ha biaruru nso n'iru Jehova, we nwua;


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.


ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.


Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora.


Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ.


O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya.


Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.


Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.


O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan