Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 10:15 - Bible Nso

15 Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n'elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 10:15
12 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.


Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?


M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n'ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom:


ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n'aka umu Israel: n'ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n'aka umu Israel, site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova.


ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.


N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel.


Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan