Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 10:13 - Bible Nso

13 Unu gēri kwa ya n'ebe di nsọ, n'ihi na òkè-gi, na òkè umu-gi ndikom, ka ọ bu, sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 10:13
7 Iomraidhean Croise  

O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.


Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n'ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n'ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n'ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel.


ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya.


N'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka i gēri ya: nwoke ọ bula gēri ya; ihe nsọ ka ọ gāburu gi.


Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan