6 Ọ gāb͕a kwa ehi àjà-nsure-ọku ahu akpukpọ, bọ ya n'ọbubọ-ya.
6 Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha.
O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú.
Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n'akuku nile: ọ bu kwa n'elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di.
Umu-ndikom Eron, bú onye-nchu-àjà, gētiye ọku n'elu ebe-ichu-àjà, do nkú n'usoro n'elu ọku:
Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.
Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya.