Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu.
Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova.
Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.
M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.
Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.