Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 3:9 - Bible Nso

9 Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 3:9
16 Iomraidhean Croise  

Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.


Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.


Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.


Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?


Buru onye jikere, e, jikere onwe-gi, gi onwe-gi, na nkpọkọta ndi-gi nile, ndi akpọkọtaworo n'ebe i nọ, gi buru ha ọchi-agha.


Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n'ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya;


M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a.


Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan