N'ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n'ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie.
Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu:
Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.