Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 3:10 - Bible Nso

10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 3:10
7 Iomraidhean Croise  

Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.


Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya; ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.


N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.


Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi.


O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan