ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.
Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M'huworo ndikom nile n'otù ka aka-ha di n'úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu?
Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.