Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 2:2 - Bible Nso

2 ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n'elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 2:2
34 Iomraidhean Croise  

o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.


Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.


Igurube we rigota n'elu ala Ijipt nile, be n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a.


ulo-gi nile na ulo ndi-orù-gi nile na ulo ndi Ijipt nile gējuputa kwa; nke nna-gi-hà na nna nile nke nna-gi-hà nāhughi, site n'ubọchi ha nọ n'elu ala rue ta. Ọ we chigharia, si n'ebe Fero nọ pua.


Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.


Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n'ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n'igwe-oji-ya nile.


ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu.


Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.


Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n'ubọchi ọ nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M'gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M'gānaputa kwa ha n'ebe nile ha b͕asara n'ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri.


I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.


Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ.


O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n'ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n'ihi na emeghi n'okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem.


N'ihi na otù mba arigokwasiwo n'alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum.


M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu.


Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu.


Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n'elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n'usoro agha.


Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi:


n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.


N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.


Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.


N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,


buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.


O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n'olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n'anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan