Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 2:19 - Bible Nso

19 Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M'ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M'gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n'etiti mba nile:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 2:19
21 Iomraidhean Croise  

Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.


M'gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n'ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ.


M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu.


M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ.


M'gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n'ihi na awukwasiwom Mọm n'ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.


O gēru kwa n'ubọchi ahu na M'gāza, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāza elu-igwe, ha onwe-ha gāza kwa ala;


ala gāza kwa ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya; ha onwe-ha gāza kwa Jezreel.


Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.


Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n'ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu.


Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi.


N'ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M'gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile.


Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.


na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.


O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n>ala-ọhia Moab lata: n>ihi na ọ nuru n>ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n>inye ha nri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan