Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 2:16 - Bible Nso

16 menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 2:16
21 Iomraidhean Croise  

Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.


si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu.


N'ihi na ha bara uba nime nkpọkọta ahu, bú ndi nēdoghi onwe-ha nsọ: ndi Livai we buru ndi-isi n'ib͕uru onye ọ bula nādighi ọcha anu ngabiga, ido ha nsọ nye Jehova.


bú onye doziworo obi-ya ichọ Chineke, bú Jehova, Chineke nke nna-ya-hà, ọ bu ezie na emeghi ka ọ di ọcha dika ime-ka-adi-ọcha nke ebe nsọ ayi si di.


B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta, Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.


Ọzọ kwa, ndi-nchu-àjà, ndi nābiakute Jehova nso, ka ha do onwe-ha nsọ, ka Jehova we ghara itiwakuru ha.


Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.


ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?


Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu.


Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.


Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.


Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.


Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan