Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu:
M'gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M'gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n'úkwù nile, na isi-nkwọcha n'isi nile ọ bula; M'gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M'gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu.
Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.