Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Juel 1:5 - Bible Nso

5 Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Juel 1:5
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.


Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!


Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.


Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:


Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan