Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jud 1:9 - Bible Nso

9 Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jud 1:9
16 Iomraidhean Croise  

Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.


Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.


Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n'ebe ahu n'akuku ndi-eze Peasia.


Ma otú ọ di, m'gēgosi gi ihe akara àkà n'ihe edere n'akwukwọ nke ezi-okwu: ma ọ dighi otù onye nēme onwe-ya ka ọ di ike n'akukum imegide ndia, ma-ọbughi nání Maikael, bú onye-isi ūnu.


Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ.


Jehova we si Setan, Jehova basiere gi nba ike, Setan; e, Jehova Nke rọputaworo Jerusalem basiere gi nba ike: onye a, ọ̀ bughi ọlọkọ-ọku alọputara n'ọku?


Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,


O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n'ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta.


N'ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n'elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n'ọnwu bilie:


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n'ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n'iru Onye-nwe-ayi.


Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan