Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jud 1:6 - Bible Nso

6 Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jud 1:6
12 Iomraidhean Croise  

N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.


kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke.


N'ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n'ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n'olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé;


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.


Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.


O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan