Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jud 1:23 - Bible Nso

23 nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n'ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jud 1:23
21 Iomraidhean Croise  

Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;


Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.


Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha, Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.


Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile.


Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha.


Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.


Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku.


Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.


Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru.


Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.


n'ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n'inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu.


Nēme-kwa-ranu ufọdu ebere, bú ndi nwere obi abua;


aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.


Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan