Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 9:27 - Bible Nso

27 Joshua we me ha n'ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 9:27
9 Iomraidhean Croise  

Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem.


unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;


Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova.


Moses we nara na nkera nke umu Israel otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime anu-ulo, ọ we nye ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.


Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:


Ndi-isi we si ha, Ka ha di ndu: ha we ghọrọ nzukọ Israel nile ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri; dika ndi-isi gwara ha okwu.


O we me ha otú a, naputa ha n'aka umu Israel, ha eb͕ughi kwa ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan