Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 8:4 - Bible Nso

4 O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 8:4
14 Iomraidhean Croise  

Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha.


Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n'azu ha: ha we di n'iru Juda, ma ndi nēru nbì di n'azu ha.


Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo.


Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile.


Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.


Ewe tikue ndi nile nọ n'obodo ahu nkpu ichu ha n'azu: ha we chua Joshua n'azu, ewe dọpu ha n'obodo.


Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali.


Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.


Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba.


Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea.


Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.


Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia:


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota.


Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan