Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 8:28 - Bible Nso

28 Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 8:28
11 Iomraidhean Croise  

Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ub͕u a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu.


Ibu eboro Damaskọs. Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.


N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.


M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.


N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.


Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;


Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.


Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan