Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 8:15 - Bible Nso

15 O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 8:15
6 Iomraidhean Croise  

N'ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka;


Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el;


Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even.


O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.


Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea.


Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan